Madubọbi Joe Page Igbo
Maka nkụzị Igbo kajara akaja. Maka ntụgharị asụsụ Igbo(Translator) etu o kwesịrị. Maka nkwalite Igbo. Ngwa sonyere anyị makana i bịara na isi mmiri�
I chọrọ ị mụta ka esi ede nakwa etu esi asụ IGBO ?.Ngwa sonyere anyị.�
Nkụzi maka e jiri mara IGBO ọ na amasị gị?
Ka ọnwa ALỌM CHI a bụrụ nke CHI anyị ga eji eme ka ndụ anyị lọọ alọ na arụike,ego na ogologo ndụ!
🙏🙏🙏🙏
🏥🏥🏥💥💥💥🏥🏥🏥💥💥💥🏥🏥🏥💥
I chetara ihe ọ bụ ?
Gịnị ka eji ya eme?
Ị mara ka esi akpa/arụ ya?
Ngwa!
Gwa anyị
Ndewo!
💂💂💂🌌🌌🌌💂💂💂🌌🌌🌌💂💂💂🌌
Gụọ ihe ndị uweoji mba Kenya dere maka ụkọchukwu ndị Katọliki zutere ọnwụ na ụlọ oriri na nkwarị akụ.💦
Ọ bụ na ọkaghị mma ị hapụ ndị ụkọchukwu ndị a ka ha malite ị lụụ nwaanyị ka a mara ma ụdị akụkọ ọjọ ana akọ na isi ụfọdụ ha ọ ga akwụsị?
Mana kedụ kwanụ maka ndị ụkọchukwu ndị ụka nke ha na alụ nwaanyị mana ha ka na "ata ụmụ nwa"?🚶
Ọ kwa ị hụrụ na ihe na eme na ebe "ndị uwe ọcha" nọọ
Mana ọ kwa ka ọ dị bee Oke ka ọ dikwa bee Ọgịnị makana ndị Eze nwaanyị ụfọdụ nakwa ndị Dịbịa ụfọdụ na "atakwa ụmụ nwa" gwo gwo.
Onweghikwa ebe efe nyere cha cha😵
Gịnị ka i chere aga eme ọnọdụ ọjọ ndị a?
Ndewo!
© Madubobi Joe
♨♨♨🌀🌀🌀♨♨♨🌀🌀🌀♨♨♨🌀
Bikonụ!
Kedụ ka onye bụ Ọchịagha ihe mmụọ ga esi akọ ihe dịka ana aghụsịsị anya na nsogbụ obodo ọ bụ onyeisi agha mmụọ bụ ihe mmụọ na enye ya bụ obodo nsogbu?
Kedụzị ihe mere o jiri bụrụ Ọchịagha ihe mmụọ?
Ọ makwa na ọgụ bịara d**e ma d**e agbaba ọsọ, ọ bụrụ ụjọ?
Ọ na agba ka Ehi tie onye? 🚶
Ka ọ na akọwa na ya bụ agha mmụọ obodo ọ bụ Ọchịagha ihe mmụọ karịrị ya?
Ka ọ bụ na o ji nganga agbara Ehi ọsọ?
Echekwa m na ọ na abụ ihe ike mebe, d**e apụta ma gosi ihe o jiri bụrụ d**e?
Mmadụ ọ na enwesịa nkwa bịakwa na akwa aka na ume?🎍
Kedụ ihe i chere?
Ndewo!
© Madubobi Joe
💦💦💦💥💥💥💦💦💦💥💥💥💦💦💦💦
Chaị
Ezigbote nsogbu dịkwa .
Mmiri ejugokwa Awọ ọnụ!
Kpọrọkpọtọ agbagokwa na iru nsị Ehi!
Oji ịta arụ emegọ nọọ na ọgbọ.
Ekwu/ikwe asụghị ma mma abaghị ji.
Obodo were dere🐽
Taata!
Ka nkịtị nkịtị n´azụ ahịa Udene.
Ya bụ mmiri agafegokwa ikpere-ụkwụ
Na ezie!
Surugede bụkwa egwu ndị mmụọ.
Ọgụ nke a abụghịkwa nke nne na agbara nwa.
Nke o ji abụ ọsọ nwaanyị n´agba ejide ara ya aka.🚶
Ekete!
Ekwupuna ike.
Isi Ete adịghịzị ebe ekere ya.
Nke isi akwa ji adịkwa ebe ekechiri ya
Nwa Ọkụkọ esorogo ụmụ Ọkwa laa n´ọhịa🎍
Onye!
Ka aga akọrọ?
Na anya ahụbeghi Chike .
Ma ya fọdụkwa ị hụụ akpa ube Chike buu
Ime apụgokwa nwaanyị na ike.
Ewu amụgokwa nwa na ọgbịrị
Akwụ achakwana na ọmụ.
Enwe eweregokwa iko mmiri ekunyere ya ma laa na elu osisi💦
Arịrị !
Mana ọ kpara nkụ arụrụ sịrị Ngwere bịara ya ọrụ.
Ọ kwa onye zakọọ, ya kpoo.
Okpopughị, ọ gbaba ya nje 🍂
Ihe mara bụ na mụ agaghịkwa etukwu na nsị onye ọzọ nyụrụ
Maka ọ naghị abụ ,Ewu taacha ji, eze erebe Nkịta
O metara!
Ya were isi ya buru.
Ọ kwa isi kota Ebu, ọ gbaba isi?💖
Ndewo!
© Madubobi Joe
ka mmiri doro edo bụrụ mmiri anyị ga ekute na ọdọ mmiri taata!
🤣🤣🤣💦💦💦🤣🤣🤣💦💦💦🤣🤣🤣🤣
Ụnụ anụgonụ na ndị China akparago ụlọ abụọ ndị Naijiria nwe dị na UK aka ma na ere ya na "ebay"😀
Ha tinyere ọnụ ego ha ga ere ya bụ ụlọ abụọ 4.4 millon dollars
O nwere ihe ọzọ ga agba akaebe na Naijiria tiri eti nke ọjọọ ya?
Ka ihe anyị tụrụ CHI n´ahịa taa bụrụ nke ọ ga azụtara anyị
🙏🙏🙏🙏
😵😵😵💦💦💦😵😵😵💦💦💦😵😵😵😵
Onye arụ dị kene CHI
Arụike bụ nnukwute akụnaụba
Ọ kwa ka mgbe abalị ise ka nwoke nọọ na ụlọ ọgwụ.
Onweghidi otu mkpụrụ ihe m na aghọta.👯
Mana ekene dịrị OKIKE na taata ,dọkịnta asira m :laa na ị dịgo mma💖
😭😭😭💀💀💀😭😭😭💀💀💀😭😭😭
ARỤ mere kpatakpa m!
Ọ bụrụ akwụkwọ nsọ ọ sị "it is finish"(Ọgwụsịgo)🔴
Ihe ala IGBO ga aghọ na arọ ole na ole dị na iru bụ "anụụ ntị echie"
Ihe ọjọọ ndị ana ahụ ugbu a ga abụ "ofe nkupu" na ebe nke bụ "arụ gba ọtọ" dị na iru nọọ.👿
Arịrị egbuo m!
Were ntị gị nụrụ ihe ha na eme.
Ndewo!
© Madubobi Joe
🚶🚶🚶💥💥💥🚶🚶🚶💥💥💥🚶🚶🚶💥
Ọ kwa isiokwu a ka akpụ na ọnụ na FB.
Kedụ ihe i chere?
Ọ mara ihe ọ na - akọ?
Ka ihe ọna akọ akarịrị ya?💦
Udo na Ndụ dịrị gị
© Madubọbi Joe Page Igbo
👯👯👯🌌🌌🌌👯👯👯🌌🌌🌌👯👯🌌🌌
Ked ihe i chere ?
Ihe o kwuru: ọ bụ eziokwu?
Gwa anyị💥
Ndewo!
© Madubọbi Joe Page Igbo
Taata! :onye anaba kwara ndụ ya, ya biko loo ya n´afọ makana ejighi ndụ eme ọgọ.
🙏💚🙏💚🙏💚
💢💢💢💦💦💦💢💢💢💦💦💦💢💢💢💢
Ọgịnịdị ?
Chi zọba o!😀
⚫⚫⚫🚶🚶🚶⚫⚫⚫🚶🚶🚶⚫⚫⚫
Kedụ kwa nke bụ Mmadụ ịlụ Nkịta ka e were me ka ajọ ihe pụọ na obodo ha?
Eziokwu!
Ụfọdụ ekpemekpe gwụ kwara ike.
Oo!
Ndị Hindus !
Ụnụ na emekwa ncha😭
Gịnị dị ka ana akọ?
Ụnụ kesịa, biko chịkọrọ kwanụ o!
Ndewo!
© Madubọbi Joe Page Igbo
👿👿👿👴👴👴👿👿👿👴👴👴👿👿👿👿
Ọ kwa ndị a bụ na ndị ụka na enwe ajọ aha.
Lee kene ihe ana eme dimkpa n´aha "deliverance"
Chaị
Arịrị !
Mana ọ bụ onye mmiri hụrụ ụkwụ ya ka ọ na eri.🚶
A sịrị agabazịa ụka si tufuo ụbụrụ isi eji eche echiche?
Azị gbakwa !
Ndewo!
© Madubọbi Joe Page Igbo
SHETIMA bụ osota onyeisi ala Naịjịrịa akpọra ndị na eme ngagharị iwe IDIOTS
Ka igirigi ndụ wụsa anyị taata.Makana Ọ kwa ndụ bụ isi.Onye dị ndụ nwere olilianya!
🙏💜🙏💜🙏💜
😰😰😰💢💢💢😰😰😰💢💢💢😰😰😰😰
Ga nke ọma!
Laa na udo!
Nnukwute Ada IGBO pụrụ iche.💦
Ọnwụ ajọka!
Ọnwụ ama egbu!
Ọnwụ dị njọ!⚫
Mana ya dịba!
Igwe niile gaje/jekọ na ụzụ.
Ọ kwa azọtasịa ndụ , abịakwa debere ya ọnwụ!
Ka ezumuike udo pụrụ iche dịrị mkpụrụ obi gi
Jee nke ọma!
Agụ nwaanyị💖
Ndewo!
© Madubọbi Joe Page Igbo
Ka aka aja aja anyị taata butere anyị ezigbote ọnụ mmanụ mmanụ.Makana onye rụọ orie!
🙏💙🙏💚🙏💚
Ka aka aja aja anyị taata butere anyị ezigbote ọnụ mmanụ mmanụ.Makana onye rụọ o rie!
🙏💙🙏💚🙏💚
🍂🍂🍂🐾🐾🐾🍂🍂🍂🐾🐾🐾🍂🍂🍂
Ngwa mejuo ILU a
👇
Ihe eji asị ka egbuo NGWERE nwere ọdụ abụọ bụ...
Ndewo!
© Madubọbi Joe Page Igbo
💥💥💥🎩🎩🎩💥💥💥🎩🎩🎩💥💥💥💥
Nwanne m!
Kedụ ọfọ ị na agọ na isi m na ụzọ pụrụ iche taata bụ ncheta ọmụmụ m?💖💜💚💙
Ka ORIE taata rigbuoro anyị ọnwụ ma ritere anyị ndụ.Makana ndụ bụ isi!
🙏💖🙏💖🙏💖
🎄🎄🎄☀☀☀🎄🎄🎄☀☀☀🎄🎄🎄☀
Gịnị ka ọ bụ?
Ked ihe eji ya eme?
Kedụ ihe IBIRIACHỊ pụtara?
Ka ỌKALA ATRỤKPA(Eziokwu) were okee na ndụ anyị makana eziokwu bụ ndụ!
🙏💚🙏💚🙏
😰😰😰💢💢💢😰😰😰💢💢💢😰😰💢💢
Ịnụkwa ?
Ọ kwa ndị dị etu a na ewetara ndị ụka ajọ aha.
Ụdị izu ohi anya a kazikwa njọ n´aka ndị bee anyị kpọrọ onwe ha "Pasịtọ" ☀
Ọ kwa onye aghọgburu ka agbara.
Mana otu nnukwu ihe ịgba anya mmiri dị na ya bụ na ị ga-ahụkwa ndị "ụmụ Atụlụ Chineke" ekperima nwoke a ji ihe a saa isi dị egwu ma rie ha "office" na isi♒
Biko!
Ụdị ekpemekpe ọbụna ikwenyere na ya ; ọ bụ na ụka maọbụ na Omenala uche gị dịkwa ya mgbe ọbụna gị na "ndị n´agba ụkọ" na ekpemekpe ndị a na emekọ ihe.♻
IGBO n´asị:onye dibịa n´agbara afa na agba kwara onwe ya afa uche.
Maka ọbụghị ọ bụrụ na dibịa gbasịara gị afa ma ọkụghị gị okpokolo Mbe na isi, ịgaghị amata ihe ọgbarụ gị n´afa.
Ngwere sịrị na ọ na esite na ije ụkwụ Mmadụ amata onye ga atụ ya iche🚣
Ị na eche ka eburo gị na amụma maọbụ ka agbara gị n´afa na nwoke a bụ ezigbote "Ogbu Igbo", Ndị atụọ n´iru aghọrọ n´azụ , Ndị o soo Chi egbu.🐙
Mụrụ anya !
Nwanne m!
Yagazie!
Ndewo!🙏
© Madubobi Joe
ỌFỌ anyị taata bụ:EGO bụrụ "otolo' ya gbakwa ihe mmetụaka anyị.Ka ọ na añyụ pụrụ ego esepụ aka.!
🙏💚🙏💚🙏💚
💖💖💖👯👯👯💖💖💖👯👯👯💖💖💖
Asịna ihe NKIRI akarighi IKIRI mmanwụ
Ya mere na ka ana EKIRI mmanwụ ka ana EKIRI kwa onye tie mmanwụ
===Okwu Igbo===🐦
O were bụrụ maka ife NKIRI nwa Favour Dominion ekwe ncheta ọmụmụ ya na adasiike ka ikoro na ụbọchị taata.
Asamma mma zuru arụ!
Nwaọma na eme mma!
Adaugo sọrọ ụsọ NKIRI ka Ugo!
Iruugo Ugo ji dị ebube!
Akwaugo Ugo ji dị nnukwu ọnụ ahịa!
Acharaugo Ugo ji egbuke ka amụma!
Ugomma Chi jiri kee Ugo na mma!💚💜❤
Anyanwụ Ụtụtụ!
Apụnanwụ!
Ọwụwa Anyanwụ!
Anyanwụ apụtaghị ma chi efona!
Anyanwụ na enye ihe!✨💥🌟
Mmasinachi !
Nwa Chi ji ọñụ were kee!
Mma Chi chọrọ gị abụghịkwa nke ana eteta na ude.Ọ kwa ọnatarachi na onwe ya.
Taata OKIKE tụkwasara gị arọ na elu arọ, ka OKIKE werekwa arụike kara gị maa mma were chọọ gị mma na elu mma.
Ka Ohimmiri ego buru gị ma buga gị na isi mmiri nke OKPOGHO ebe AGALI OVU sị asụpụta.💦
Asị m Ego bụrụ "Otolo" ya gbakapụkwa ihe mmetụaka gị anya ka ọ na añyụpụrụ gị Ego esepụ aka ka nsị Ọbagwu.🐤
Ị ga-adịkwa ka echi maka na echi anaghị agwụ agwụ.Ị gaghịkwa adị ka Ji eji agba ụtụtụ maka na onye ji Ji agba ụtụtụ amaghị na emesịa Ji ga agwụ mana ụtụtụ anaghị agwụ agwụ.✌
Nwoke na eche ajọ ihe ọ ga eme gị ; ibi dakwa ya ,afọ tokwa ya.
Nwaanyị na agara gị ajọ ije ga adarịrị ngwọrọ ma kpukwa isi bịazịa saba asịsa.
Makana onweghi onye ị nọchiri, ya mere na mmụọ na mmadụ agaghịkwa anọchili gị.
ị ga eme ụwa gị na mma.
Etu Chi siri kee gi na mma♨
Yagazie!
Ndewo!🙏
© Madubobi Joe
Click here to claim your Sponsored Listing.
Videos (show all)
Category
Contact the public figure
Telephone
Website
Address
Onitsha
You need update like what happening around the world? here you are ...sports news politics, gist, etc