Chimefula Research Centre
A Home for Igbo Historical Studies
Our discussion on "Ije Ụwa" will take place on Monday 27th November, which is the final day of this quiz. Time for the discussion will be 10am.
November Igbo Literary Quiz (js1-3) loading...
Nwa gị ọ ga-esonyekwa?
9 people have been selected to receive a copy of "Ije Ụwa" each. The books have also been sent...
We considered those who joined in our last discussion first, followed by those who indicated interest earlier than others...
The date of the discussion will be revealed soon.
We require of each of these 9 persons to snap the book and post on the comments section for us to confirm.
Daalụ nụ!
It pleases us to announce that 9 copies of "Ije Ụwa" will be distributed to 9 different people free of charge, and as usual they will not pay for the way bill...
This drama, originally written by Chioma Emelone and translated into Igbo by Dr Chidoomebube Ezika, will soon be used for our next discussion here...
Let's also be reminded that our "Igbo Language and Culture Quiz" this month will be based on the discussions we will have on this book and that of "Nwanne M" and "Olileanya M"...
Prizes for the quiz will be:
1st - 20,000 naira
2nd - 10,000 naira
3rd - 5,000 naira
10 other people will also get 3,000 naira each..
If you are conversant in Igbo, and really want to get a copy of "Ije Ụwa" and join us in the discussion, do indicate in the comments section. Those who joined in our last discussion will be considered first...
Soro anyị kwalite asụsụ na omenaala Igbo. Ndeewo nụ!
Our discussion topics are 10 in number. Please make sure you comment on each of them as soon as you see it. Daalụ nụ!
NDỤ MMIRI NDỤ AZỤ
Mmiri atala
Ma azụ anwụla
Otu meekwanụ?
Mmiri ọdị ndụ?
Azụ ọbụ mmadụ?
Jụọ ndị nna nna m
Nwa mmụọ emegbule nwa mmadụ
Nwa mmadụ emegbule nwa mmụọ
Mmụọ onwere ahụ?
Mmadụ ọbụ nwa mmụọ?
Ụwa mmadụ na mmụọ ọbụ otu?
Jụọ ya ndị nna nna m
Aka nri kwọọ aka ekpe
Aka ekpe akwọọ aka nri
Otu jụkwanụ ịkwọ ibe ya?
Onye nwekwaranụ otu aka?
Ya were ụkwụ kwọwa
Ndị nna nna m maara nke ọma
Ọbịara be onye abịagbula ya
Mgbe ọ ga-ala mkpumkpu apụkwala ya
Ọ chọ gịnị bịa?
Ebee bụ be mmadụ?
Ihe ọma onye mere egbule ya
Echiche ndị nna nna m dị n'ime osimiri
E mee nwata ka emere ibe ya
Obi ga-adị ya mma
Onye ka ọ dịịrị ime?
Onye mejọkwaanụ nwata?
Ihe ọma adịghị agwụ agwụ
Isi iyi nke ndụ ndị nna nna m
Mmiri na azụ
Mmụọ na mmadụ
Aka nri na aka ekpe
Ọbịa na onye nwe ụlọ
Nwata na ibe ya
Were ire gị gụọ eze gị ọnụ.
ỤWA M
Ebuliela m akụkọ ụwa m
Ka m kọọrọ ụmụ ụwa ibe m
Na mmalite akụkọ ka m ka nọ
Okwu agwụ m n'ọnụ
Ụkwụ atapara m n'ala
Eche m na m ji akụkọ bịa
Amaghị m na enwere akụkọ ka akụkọ
Ụwa m
Ọkwa ị hụla otu I si lechaa anya
Chịpụta m ụkwụ n'ama
Ọ bụrụ na i gere ntị
Dowe ihu ka mụ na gị si kpaa
O nweghị onye gaara anụ olu mụ na gị
Ugbu a aghọọla m ekwurekwu
Agwara m gị ihe m chọrọ ịbụ ma m too
Gị ekwechaa m n'isi
Bịa were m dowe n'okpuru oche a
Ọ bụ ihe mụ na gị kpara?
Ka ntị ọna-enye gị nsogbu?
Ị mara ihe ahụ na-ese okwu
Biko emekwala m ya
Ụwa m
Ọ bụ eziokwu na m ahụla
Ndị ka mụ mma ebe ọ dị ukwuu
Ewerekwala m anya m abụọ hụ
Ndị m ka mma ugboro asaa
Biko tụgharịwa m atụgharịwa
Egbukwala m egbu
Tụwa m okwute
Ka m were ya na-arụ ụlọ elu
I kunye m aja
M were ya chụọ àjà
I nyetụkwuo m mmiri
Ụlọ m akwụrụ
Abịaghị m ụwa igbu onwe m
Ụwa m
Abịala m abịa n'ụwa
Dịka ị na-echi m ọnụ n'ala
Na-enyetụ m mmiri ara ehi
Ejighị ahụhụ anya isi
Akụkọ ije mụ na gị
Dịịrị sọ mụ na gị, ya dịwa.
NWAMBA
Nwaologbo
Nwaobili
Buusu
Ọnya na-ama oke
Anụ ji abalị mere ehihie
Anụ bi n'ụlọ biri n'ọhịa
Na mba ndị ọzọ
A na-eku gị n'aka ka nwa
Ma n'ala nna m
Ị dị ka ụsụ na udele
Gịnị ka i mere ndị be anyị
Ha jiri kpọ gị asị nke ukwu?
Ị bụ anụ dị jụụ
Ije gị bụ ije selense
Ị bụ onye ọcha bụrụkwa onye ojii
Anya gị na-eke ka ọnwa n'abalị
A pụrụ ịgụta afụfụọnụ gị ọnụ
Abalị ka i ji akpa nri
Gị na agwọ bụ nwanne
Ndị Ibusa ji gị emetụ ọnụ
Ebe ụmụnna ha ejighị anya ahụ gị
Mbọ na eze gị ka i ji eme ìrè
A na-atụ gị egwu ka echi adịghị
Buusu, ị bụ amusu?
A na-eze onye nwere gị eze
Gị bụ anụ dị nwayọọ ma dịkwa ọjọọ
Oke agaghị abụnwu ọgọ gị
Ụkwụ gị dị ka nke ụgbọ oloko
Sọ ihe ọjọọ ka e ji atụnyere gị ebe a
Ị sị na mmetụta ahụ
Bụ ụtọ ndụ
Ị nyụọ nsị, i kpochie ya aja
N'ihi na ọdịghị ara ahụ
Ihe mmadụ aghọọ nke onye ọzọ
Nwamba, n'akụkụ ebee ka i si bịa ụwa?
EWU
Onye nwere ọkụkọ asaa
Na onye nwere otu ewu
Abụghị ọgbọ
Onye nwejuru nne ewu ụlọ
Gbara aka mkpi
Anụ ụlọ ya ezubeghị
Ewu bụ anụ ụlọ
O nwere ụkwụ oche
Ya na mmadụ abụrụ nwanne
Mgbe ọbụla ọnụ na-adị ya nkọ
Afọ anaghị eju ya eju
Ọ na-ata, ọ na-ele ziii
Ụra anaghị aga ya n'anya
Ọba dị ya n'ime afọ
Ọ na-ebu injin n'afọ akpagharị
Otu nwa abụghị maka ya
Ara ya ka o ji azụ ụmụ
Ụmụ ya na-eji ilere anya amụ ihe
Oke mkpi anaghị ekwe nne ewu zuru ike
E ji nsogharị na isi imi gwọọrọ ya ọgwụ
Onye oke mkpi gafere n'ụzọ
Ga-atụgharị kunye ya mmiri
Onye a kpọrọ ewu
Ọ maburu nkume n'obi
Mana e kee anụ ewu kefee ya
Ọ jụọ ma eze ọgwụrụ ya n'ọnụ
Anụ ọbụ a jụrụ ajụ
Oke ihe mee, a chọwa ya
Nsị ya dị ka mkpụrụ pọpọ
Afọ ya dị ka nke otokoto
Anya ya na-egbu gere gere n'abalị
Ọkụkọ bụ enyi ya nwanyị
Ọ na-akpakwara onwe ya nri
Ewu bụ ụba, isi ya dị mma na nkwọbi
Ụmụ mmadụ na-aza aha ụmụ anụ
Mana onweghị onye na-aza nwa ewu
Okenye anaghị anọ n'ụlọ
Ewu amụọ n'ọgbịrị
Onye taa anụ ewu
Ọ mara na ọ tara awọ gbara abụba.
We shall continue our discussion in less than 30 minutes.
The 2nd part of our discussion will be by 5pm.
Please keep commenting...
CHIGỌZIE
Nna bi n'igwe
Ụwa ibe m bịara
Ka m bịara
Mgbe ha jiri bịa
Ka m jiri bịakwa
Mgbe anyị ji ala
Ọ dịghị onye ị gwara
Gọzienụ m
Ka I si gọzie ibe m
Ihe m na-achọ n'aka gị
Bụ nwa ntakịrị ihe a
Anaghị m amanye gị amanye
Uche gị ka mma
Oge nke gị kacha mma
Ka ọ dị ka anyị si kpaa
Chetakwa itinyere m mmezi
Ihe ọma meere nwanne m
M soro ya ṅụrịa
O ruturu ibe m
Ọ ga-erutekwa m
Onweghị onye I chefuru
Nna gọzie m
Ka m gọzie ndị ibe m
Gọzie ndị ụlọ m
Ka ọṅụ anyị zuo oke
Gọzie ndị enyi m
Ka anyaukwu na ekworo laa
Ka uche obi gị bịa na mmezu
Chukwu biko cheta
Akwụkwọ ozi ahụ m detaara gị
Cheta ụmụ ụwa nọ n'ahụhụ
Ma mee ka ọnụ ọchị waa ha
Cheta ndị e ji eji mee ka nwere onwe ha
Ka m gaa gbatụwa mbọ
Na-eche azịza arịrịọ m.
ỤDARA MMỊCHA M
Okeọkpa kwaa n'isi ụtụtụ
M cheta na ị nọ m n'akụkụ
Abalị ebidogharịa n'isi
Gị ka ụmụ nwoke hụrụ
Kweta na otu ihe ga-egburiri nwoke
Ị bụ ọnwụ na ndụ m
M tụpụ ụkwụ m n'ụlọ
Obi m anaghị eso m apụ
Ọ na-anọgide gị
Na-egori na-aṅụrị
Onye nke a ọ chọtara
Dị ya ka o gburu ényí
M na-aga n'okporo ụzọ
Ihu gị ka m na-ahụ n'ihe niile
Ọ na-adị m ka oge gbapụ ọsọ
Ka m bịakwutekwa gị ọzọ
Ụtụ m, ihe ndị ọzọ na-achọ n'uko elu
Ka m tukwuuru ala zute n'uko ala
Ụwa m abụrụzie saraaaa!
ỌNKỤLỤ
Ndị na-ama Chukwu aka
N'ikwe nkwa
Bụ ndị ọnkụlụ kara aka
Ọnụ ka ha ga-eji
Kwọfee gị n'oke osimiri
Ma otu abụghị n'ezi
Ị ga-agarịrị akwụkwọ
Aga m azụru gị na Kembriji
Gụsịa pụta ọrụ na-eche gị
Bịa hụ m ụbọchị dị otu a
Ka m mara nke m ga-emere gị
Ndị oji ọnụ egbutu ọjị
Ihe ahụ nna gị na-agaghị emere gị
Gwuo olulu tukpuo ya
Nkwa eme eme a
Ka ndị nwanne nna njọ
Ọ bụkwa ọbara jikọrọ ha na nna gị?
O nwekwara ndị bụ ndị ọma
Ekpere gị mgbe niile bụrụ
Ka Chukwu dotere gị nna gị ndụ
Ole aka kwere ya
Ka ọ tụkwasị na ndụ unu
Ihe anya na-ahụ n'ụwa erika
Chukwu zọba ụmụ ya.
ỤWAEZUOKE
Isi ukwu
Chọrọ olu gbara abụba
Onye anyaukwu
Na-enwe akpa ukwu
Ụwa juru eju
Ozuzu oke kọrọ ya
Nwa mbei ụwa
Na ahụhụ
Na-agba ọgbụgba ndụ
Biri ka oke na ngwere
Ọ na-adọlị
Ụwa ana-adọ ya
Mmiri ibe ji akwọ aka
Ka ibe ji ezere ndụ
Ọkpụkpụ nkịta onye
Bụ óké anụ nyere onye
Ụwa amaka
Mma ya dị ya n'okpuru ụkwụ
Onye kworo ihe òké na-eme
O suo ụlọ ya ọkụ
Onye lewe ụwa
Ọ basị ya ọgụ kugbuo ya
Ma nke ụwa na-eme
Dị ya n'obi
Ka aka m ha
Ka m ga-ebido n'úkwù
Ụwa na-elu m okwute
M were ya rụwa ụlọ
Ọgịga ọgịga bụ ije
Ndụ bụ isi ya.
CHI EWERE EHIHIE JIE
Afọ 2019, afọ enweghị nchezọ
Abalị iri na isii nke ọnwa Ọktoba
Ụtụtụ bụụrụ m ọchị
Anyanwụ gbanaghara m
Were ehihie lakpuo ụra
Chi jiri m n’ihu
Bọọ m n’azụ
Ọ bụrụ na mmadụ gwara m
Onweghị ihe ga-eme ka m kwere
Njinji jibidoro ala nna m
Mberede nyịrị d**e
Otu mkpụrụ akị
Gbagburu nnụnụ niile nọ n’ọhịa
Mkpu tiri n’elu
Ụzụ atụọ n’ala
Ebee ka a hụrụ enyemaka?
O jere ikwu nne ya
Ụbọchị a riri m ọnụ n’ezie
Asaghere m ọnụ
Mana mkpu ekweghị m otiti
Anya ka m ji na-ele
Ebe mmadụ na-aha mmanụ
Ka anụ ezi a na-ahụ n’ọkụ
Echeliri m anya m elu
Jụọ Chukwu ajụjụ
I mukwa anya?
Ị nọkwa na-ele ọnọdụ ụmụ gị?
Ndụ lara na nta
Ngwa ahịa funyuru anya
Ihe m na-atụghị anya ya
Eripịala isi ezinaụlọ m
Ụwa
Gịnị ka m mere gị?
Ọkụ gbara ahịa Ọchanja Ọnịcha
Ị gbasịala
Mana ị gbasịbeghi n’obi m
Ndị ọ dị n’aka, kedụ ebe unu nọ?
Chukwu, biko nye ụmụnne m ezumike mkpụrụobi
N’ihi na ihe ka nte
Bakwutere ya ọnụ
Loo ya kpamkpam.
NKỌWA MAKA AKWỤKWỌ NA ONYE DERE YA..
Olileanya M” bụ akwụkwọ abụ nke nwere ọmarịcha abụ 67 nke na-akọwa ihe dịgasị icheiche na-eme n'ụwa. “Olileanya M” bụ aha otu n’ime abụ ndị dị n’akwụkwọ a...
Odeabụ họọrọ ịkpọ akwụkwọ a “Olileanya M” iji gosi na n’agbanyeghị ihe isi ike juru ebe niile, na olileanya dị n’ebe ndị Igbo na asụsụ ha dị n’ihi na ndụ bụ isi...
Dịka akwụkwọ nke mbụ anyị lebara anya na ya ebe a bụ “Nwanne M”, ndị bipụtara akwụkwọ a bụ ụlọọrụ Apt Publication nke dị n'Owere, steeti Imo. E bipụtara ya n’afọ 2022. Akwụkwọ a siri ike ma maakwa mma dị egwu...
Onye dere akwụkwọ a bụ Ugochukwu Benedict Alugwe bụ onye Ụmụahịa nke dị na steeti Abịa. Ọ gụrụ ihe ọmụmụ Fịlọsọfị na Pontifical Urban University, Rome na Mahadum Imo Steeti...
Biko, sonyere anyị na mkparịtaụka a
Ndeewo nụ!
10am is still the time...
Please join.
The first part of our discussion tomorrow will begin by 10am (Ala Igbo time), while the second part will begin by 5pm.
Please join.
AKPỤ BỊARA IGBO ỌGỤ JI NA EDE.....
Pay attention to the audio, not the screen.
ADA IGBO nyere azịza a maka ajụjụ anyị jụrụ gbasara "akpụ bịara igbo ọgụ ji na ede..." 👇..
Akpụ si obodo ọzọ (Portuguese) bịa n'ala Igbo mana ọ bịarazi, buruzie isi nri n'ala Igbo.
To enable many people join in our discussion on "Olileanya M" which will take place on Monday, we shall be posting the discussion topics together with the selected poems.
Please join...
Lee nkọwa ụfọdụ anyị nwetara maka ajụjụ anyị jụrụ gbasara "ịnwụ ọkwa n'aka". 👇..
"Ọkwa na-eji awa abụọ etete ụra ihe dịka elekere anọ nke ụtụtụ wee fepụ́ ịmalite ọrụ dịịrị ya n'ụbochi. Ebe ọkụkọ n'eteta ụra ihe dịka awa abụọ Ọkwa tetachara.
Otú a ka chi si kee/mee ya". - Charles Umeze..
"Ọkwa bụ nnụnụ na apụtakarị n'isi ụtụtụ. Ya mere, onye ga ejidenwu ọkwa ga-ama nnukwu ụzọ wee pụta ka ọ were hụ ọkwa.
Ọ wee bụrụ na onye nwudenwuru ọkwa nwụrụ ya n'aka bụ onye mara nnukwu ụzọ wee pụta.
Uche m ka m kwuru🤔" - Cynthia Amaka Agummadu...
Onye nwere ihe ọzọ ọ ga-ekwu kwuo...
Ndị be anyị, ọ na-agakwa?
Onye ọbụla jisie ike na nke dị mma ọ na-eme.
Ka ọnwa NOVEMBA A BAARA anyị uru oo.
Lee azịza Pius Obuboegbunam nyere maka ajụjụ anyị jụrụ gbasara "naị". Anyị kelere ya na ndị ọzọ tinyere ọnụ n'okwu n'ajụjụ ahụ. Onye nwekwara ihe ọzọ ọ ga-ekwu kwuo...
👇
"Naị" bụ ego ochie eriburu bosị bụrụ gboo! Ego a chụrụ achụ. Ugbua, a na - agbanwezi ego agbanwe. Mana n' oge mbụ, ọ na - abụ erikata ego, ego ahụ alaa.
Ọ bụ etu ahụ ka ego akpọrọ "Naị" si wee laa. Ka "Naị" lachara, anaghizi agunye ya n' ego, etu ahụ ka esi chefuo ya kpamkpam.
Ọ bụrụ na-asị na mmadụ alaala ka Naị, ihe ọ pụtara bụ na nke onye ahụ agaala n' ụdị:
ọnwụ
eloghi n' ihe
njefu
uche ezughizi oke
wee dịrị gabazịa!
Ndeewo nụ, ụmụ Igbo...
Last month, we had a discussion here on "Nwanne M", a poetry book written by Ugochukwu Benedict Alugwe. We will have another discussion on "Olileanya M" by the same author on Monday 6th November, 2023...
It is from those who join in the discussion that we will select the 10 persons that will receive "Ije Ụwa" which will be used for the next discussion...
Finally, our next month "Igbo Language & Culture Quiz", will be based on these 3 discussions, and only those who will participate in the two remaining discussions can participate in the quiz...
Prizes for the quiz will be:
(1st - 15,000 naira),
(2nd - 10,000 naira),
(3rd - 5000 naira),
(next 10 persons - 3000 naira each)
Ten copies of this beautiful book "Ije Ụwa", written in English as "The Inherited Curse" by Chioma Emelone, translated into Igbo by Dr. Chidoo Ezika have been donated to us by Dr. Chidoomebube Ezika (one of the judges in our last month "Igbo Poetry Challenge"), to be used for a discussion on our page...
Further information on this will be posted tomorrow evening).
Daalụ nụ!
"Akpụ bịara igbo ọgụ ji na ede buru ọnụ mmee mmee"...
Ị nụtụla okwu a? Ọ bụrụgodu na ị nụtụbeghị ya, gịnị ka ị ghọtara na ya? Biko, gwa anyị.
6 outstanding participants of our programmes, "Monthly Igbo Literary Quiz" and "Igbo Language & Culture Quiz" have all received their prizes. These ones have also received their certificate awards...
Congratulations to them!..
More activities are coming.
Thanks Everyone
This is about the time our 6 best participants sent their answers:..
1. Maazị Aka Elinwa: 9.02pm/9.02pm/9.02pm
2. Peace Benjamin: 9.05pm/9.04pm/9.03pm
3. Chiemeziem Everest Udochukwu: 9.04pm/ 9.10pm/9.01pm
4. Odilamma Joy: 9.05pm/9.09pm/9.07pm
5. Joshua Nnachi: 9.06pm/9.13pm/9.04pm
6. Pius Obuboegbunam: 9.10pm/9.08pm/9.05pm..
Thanks to all the participants.
CONGRATULATIONS TO THE WINNERS!
Let them send their account numbers to us via whatsapp.
A total of 17 persons participated in our October Igbo Language & Culture Quiz. ..
The following 5 persons got all the 10 questions:
1. Chiemeziem Everest Udochukwu
2. Odilamma Joy
3. Joshua Nnachi
4. Pius Obuboegbunam
5. Maazi Aka Elinwa
6. Peace Benjamin ..
As we planned, we will check the time by which they sent their answers so as to get the 3 winners. It will be posted by 8pm tonight.
14 participants sent their answers in time during the final part of our quiz held yesterday...
12 people got no.7
Everyone people got no.8
11 people got no.9
13 people got no.10
9 people got the 4 questions...
Winners will be posted by 8pm today. ..
Unu anwụchula!
Unu emeela! Rahụnụ nke ọma oo...
Ị na-ejikekwa?